Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchie VeryDarkMan maka ebubo ịmetọ aha Mercy Chinwo Mercy Chinwo na Very Darkman

0 331

Ụlọikpe Magistrate dị n’Abuja enyela iwu ka a nwụchie onye a ma ama na soshal midia bụ Martins Vincent Otse e ji VeryDarkMan (VDM), maka ebubo imetọsị aha na ugwu otiegwu ụka a ma ama bụ Mercy Chinwo.

Ụlọikpe a nyere ndị uweojii iwu na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha nwuhchie VeryDarkMan na kpọta ya n’ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya.

Ọkaikpe Emmanuel Iyanna nyere iwu a n’ụbọchị Tọzde 13 Maachị, 2025 mgbe VeryDarkMan jụrụ ịbịa n’ụlọikpe zaa oku ụlọikpe a kpọrọ ya n’ụbọchị 5 Maachị, 2025.

Mana ọkaikpe VeryDarkMan bụ Deji Adeyanju rịọrọ ọkaikpe ka o chegharịa n’iwu o nyere ma kwuo na ọ ga-eji aka ya kpọta VeryDarkMan n’ụlọikpe.

Mana Ọkaikpe Iyanna jụrụ ma kpaa isiakwa na ọ bụ ndị uweojii ga-akpọ VeryDarkMan abịa n’ụlọikpe.

Cheta na Chinwo na ọkaiwu ya kpụpụrụ VeryDarkMan n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja sị ka ọ kwụọ ha otu ijeri naịra na ụma maka ịmetọ aha ya.

Nke a na-abịa site na mgbasaozi VDM mere banyere esemokwu dị n’etiti Chinwo na onyeisi bụbu Ezekiel Onyedikachukwu n’ihi ego dị puku narị dọla atọ na puku dọla iri anọ na ise ($345,000).

VDM katọrọ aha Mercy Chinwo n’ụzọ dị iche iche.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *