Take a fresh look at your lifestyle.

Chaịna na Kanada ga-emegwara dịka ụtụisi Trump manyere na ngwaahịa ha

0 179

Mba Kanada na Chaịna edila njikere imegwara ma manye ụtụisi na ngwa ahịa e si mba Amerika atụbata na mba ha abụọ.

Chaịna na Kanada kwuru nke a dịka iwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump manyere na ngwaahịa e si mba abụọ ahụ ebubata n’Amerịka bidoro uyaa.

Kanada kwuru na ha ga-amanye ụtụisi ruru pasenti iri abuo na ise na ngwaahịa si mba US abata na Kanada nke ọnụ ego ya ruru $150bn.

Ozọ bụ na Chaịna kwuru na ha ga-amanye ụtụisi ruru pasenti iri ruo pasenti iri na isii na n’ihe niile a kọpụtara n’ubi e si mba Amerịka atụbata na mba Chaịna.

Trump na-ebo mba Chaịna ebubo na ha adịghị akwụsị ọgwụ a na-akpọ ‘fentanyl’ na mba Amerịka ma mee ka ụtụisi na ngwahịa si mba Chaịna abata n’Amerịka ruo pasenti iri abụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *