Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ezigala ozi ịtị aka n’obi nye ezinaụlọ Edwin Clark nwụrụ anwụ.
Bola Tinubu mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi ịtị aka n’obi ọ dere nke Bayo Onanuga bụ onye ndụmọdụ ya pụrụiche binyere aka.
Edwin Clark nwụrụ n’oge ọ dị afọ iri itoolu na asaa n’Abuja, isi obodo Naịjirịa.
Tinubu kọwara ọnwụ Edwin Clark dị ka “ihe na-agba anya mmiri nakwa ihe nwute”.
Ọ sị na Edwin Clark bụ otu onye nwere ugwu ma bụrụ onye a maama n’ihe gbasara ọchịchị na mpaghara Naịjirịa niile.
Ọ kọwakwara Clark dịka “onye nkuzi na ọkaiwu nwere mmasị n’ịdị n’otu mba Naịjirịa ruo mgbe ọ nwụrụ”.
“A ga-echeta Edwin clark dịka onye na-akwado ikike dịara ndị Niger Delta nakwa usoro ọchịchị ‘True Federalism’.
Tinubu kpere ekpere ka chineke tie ezinaụlọ Clark aka n’obi ma nye ha ume ịdi ọnwụ nwa amadị ahụ.
Leave a Reply