Take a fresh look at your lifestyle.

Mba Amerịka ga-achụla ọtụtụ ndị Naịjirịa

0 306

Gọọmenti mba Amerịka ekwuola na ha ga acgụla mmadụ nari abụọ na otu dịka Onyeisiala Donald Trump na-aga n’ihu ibu agha megide ndị na-enweghị akwụkwọ ikike ibi na mba Amerịka.

Ndị ahụ a ga-achụla gụnyere ndị a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị mere mpụ dị iche iche.

Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuru nke a oge Ambasadọ mba Amerịka na Naịjirịa bụ Richard Mills kpọtụụrụ ya n’ụlọorụ ya dị na Tafawa Balewa House, Abuja.

Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuru na n’ime mmadụ nari abuo na otu ahụ, e nyela nkwado ka a chụla mmadụ iri asato na ise n’ime ha mana ọ rịọrọ ka nchụla bụrụ nke nwere ugwu.

Mịnịsta ahụ gara n’ihu rịọ ka e nye ndị ahụ ohere ka ha chịkọlata ngwongwo ha na ihe ndị ọzọ ha nwere na mba Amerịka tupu a chụlata ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *