Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emeela ihe tụrụ ndị Palestine n’anya site n’atụmatụ banyere ọdịnihu obodo Gaza, nke o kwuru na mba Amerịka ga-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ iji nwogharịa ya.
Nke a bụ atụmatụ kachasị ukwuu mba Amerịka na-enwe banyere mpaghara Middle East kamgbe ọtụtụ afọ.
Trump kwuru nke a mgbe ya na Praịm Minista mba Isreal bụ Isreal Netanyahu na-eme mgbasaozi n’obi ọchịchị ‘White House’.
“Amerịka ga-ewere ọnọdụ na Gaza, na-achịkọta ebe ahụ ma kpochapụ ogbunigwe niile e liri ebe ahụ ma mezie ebe niile agha mebiri,” ka Trum kwuru.
Praịm Minista mba Isrel, Benjamin Netanyahu na nzaghachị gosiri mmasị ya n’ihe Trump kwuru, ma kwuo na ọ ga-agbanwe akụkọ banyere mpaghara ahụ.
N’okwu ya, “Dịka m si kwuo na mbụ, anyị chọrọ ụzọ ihe atọ, nke atọ bụ ịhụ na obodo Gaza agaghị abụ ihe iyi egwu nye mba Isrel.”
Mba Saudi Arabia, ngwa ngwa saghachịrị Trump n’atụmatụ ya iwere ọnọdụ na Gaza, ma jụụ atụmatụ ọbụla ga-eme ka e kposaa ụmụafọ Palestine n’ala ha.
Saudi Arabia kwuru na ha na mba Isrel agaghị enwe mmekọ ọbụla ruo mgbe e hiwere ọchịchị ndị Palestine na Gaza.
Ọnụ na-ekwuru otu Hamas kọwaara atụmatụ ahụ dịka ihe ga-ebute ọgbaghara na enweghi udo na mpaghara ahụ.
N’otu aka ahụ, mba Ijipt na Jodan ajụkwala ịnabata atụmatụ Trump nwere bụ inye ndị Palestine ebe obibi na mba ha.
Onyeisiala mba Amerịka gakwara n’ihu kwuo uche ya banyere ọdịnihu mpaghara West Bank na Osimmiri Jodan, ma kwuo na ọ na-atụle ịkwado Isrel ka ha were ọnọdụ na West Bank.
Netanyahu bụ onyeisi obodo nke mbụ ga-eme njem na White House kamgbe Trump banyere ọchịchị nke ugboro abụọ.
Leave a Reply