Take a fresh look at your lifestyle.

A malitela ịnwale ọgwụ mgbochi Ebola na Uganda

0 66

Mba Yuganda amalitela ịnwale ọgwụ mgbochi maka nje ụdịrị ọrịa Ebola si mba Sụdan.

Ọnọdụ a na-abịa dịka ọrịa Ebola tiwapụrụ na mba ahụ, gbuo otu onye ma fere mmadụ abụọ ndị ọzọ. Onye mbụ butere ya bụ ọrịa ma nwụọ bụ nọọsụ nwoke gbara afọ iri atọ na abụọ (32).

N’ụbọchị Mọnde abali ato nke onwa Febụwarị 2025 ka a gbara onye mbụ a chọrọ iji nwalee ọgwụ mgbochi ahụ ọnụọgwụ nke mbụ ya.

Ka ọ dị ugbua, enwebeghị ọgwụ mgbochi a kwadoro maka iji buo agha megide ụdịrị ọrịa Ebola si Sụdan mana ka o sinadị, e nwere otu nke a kwadoro maka ụdịrị Ebola nke si Zaịre bụ nke kachasị kpaa ike na DR Kongo n’oge gara aga.

Njirimara Ebola gụnyere ahụọkụ, ike ọgwụgwụ, ahụ mgbu, isi ọwụwa na olu mgbu ebe ihe ndị ọzọ na-esochi ha bụ ịgbọ agbọọ, otoro, arụbara na ọbara ịgba mmadụ n’ime ahụ maọbụ n’elu ahụ.

Mmadụ nwereike ibute ya site na mmekọ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *