Take a fresh look at your lifestyle.

Tems eturula ugo n’emume nrite Grammy 2025

0 90

Otiegwu a ma ama bụ Tems eturula ugo n’ihe nrite Grammy nke afọ 2025.

Tems tuuru ugo na ngalaba egwu kachasị mma n’Afrịka a kpọro ‘Best African Music Performance’ nke o ji egwu ya a kpọrọ “Love Me Jeje” rite.

O meriri ndị ogbo ya dịka Burna Boy, Davido, Chris Brown, Asake, Wizkid, Yemi Alade, na ndị ọzọ.

O kelere Chineke maka ime ka o merie, keleekwa ndị otu ya maka nkwado ha na-enye ya dịka ọ na-anata onyinye ya.

N’otu aka ahụ, Tems kelekwara nne ya bụ onye so ya bịa emume Grammy ahụ dịka o kwuru na Mọnde bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ nne ya.

Nke a bụ ugboro abụọ Tems ga-eturu ugo n’emume ihe nrite Grammy. N’afọ 2023 o ritere nke mbụ site n’egwu ya na ụmụafọ mba Amerịka bụ Future na Drake tiri, aha egwu ahụ bụ ‘Wait For You’.

A họpụtala Tems ọtụtụ ugboro maka irite ihe n’emume Grammy.

Tems dị afọ iri abụọ na itoolu, ezi aha ya bụ Temilade Openiyi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *