Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị gburu ndị isi otu ISIS na ndị ọzọ n’ime mba Sọmalịa – Donald Trump

0 80

Onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ha gburu ndị isi otu na-eyị ọha egwu a na-akpọ ISIS bụ ndị nwere otu obodo na mba Sọmalịa mere ogbe.

Donald Trump gi akara X soshal mịdịa ya kwuputa nke a ma kọwaa na ọtụtụ ndị na-eyị ọha egwu nwụrụ mgbe ndịagha mba Amerịka tụrụ ogbunigwe n’ogbe ha.

N’okwu Trump “n’ụtụtụ taata kas m nyere m iwu ka ndịagha mwakpoo mpaghara ogbe ebe ndị isi ndị na-eyị ọha egwu nọ n’ime mba Sọmalịa.

Ha nọ ebe ahụ na-azụpụta ndị ọzọ”.

“Ndị ahụ na-egbu ndị mmadụ. Ha na-emegide mba Amerịka ma na-amaja ndị ọnyị mba Amerịka”.

Ogbunigwe anyị tụrụ ha gburu ọtụtụ n’ime ha. Ọ metụtaghị ndị nkịtị”

“Ozi m na-ezigara ndị ISIS na ndị ọzọ chọrọ ịwakpo mba Amerịka bụ na anyị ga-achọpụta unu ebe ọbụla unu zoro ma gbuo unu”.

Trump gara n’ihe kwuo na ndịagha mba Amerịka na-adị na-atụ ndị omekome ahụ ogbunigwe mana ọ bụ ọchịchị Onyeisiala ha garaaga bụ Joe Biden emeghị ihe ọ kwesiri ime.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *