Take a fresh look at your lifestyle.

Ụgbọala akụgbuola otu onyeagha, merụọ ndị ọzọ ahụ na Legos

0 97

Ụgbọala akpọkaala ndịagha na-azọ njem ha na-adị eme ugboro abụọ n’afọ ọbụla, kụgbuo otu onye ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

Ozi isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa wepụtara site n’aka Olabisi Olalekan Ayeni kwuru na ọdachi ahụ mere n’ụtụtụ Fraịde abali iri ato na otu nke onwa Jenụwarị 2025 n’akụkụ Myhoung Barracks dị na Yaba nke Legọs steeti.

O kọwara na njem ahịrị ahụ bụ nke a haziri iji kwalite ikike ndịagha gburugburu Legọs steeti ma bụrụkwa nke a mara ọkwa ya n’ụlọmgbasaozi dị iche iche.

Ayeni kwuru na ihe ọdachi ahụ mere mgbe onye ọkwọụgbọala gbaara ọnwụ ọnwụ kpọkaa ndịagha ebe ha na-azọ njem ma gbuo otu onyeagha dịka ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

Ozi ahụ kwuru na a dọnyela ozu onyeagha nwụrụ anwụ n’ọbaozu ebe ndị nke merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ndịagha 68 Nigerian Army Reference Hospital dị na Yaba, Lagọs steeti.

Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na Ọchịagha na-elekọta ngalaba ụlọọrụ ndịagha 81 Division bụ General Farouk Mijinyawa ezigaraala ezinaụlọ onyeagha nwụrụ anwụ ozi nkasiobi ma kpeekwa ekpere ka ndị nke merụrụ ahụ gbakee ngwangwa.

Ka o sinadị, ọ kpọrọ oku ka onye niile dere duu n’ihi na ndịagha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọghọrọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *