N’oge gboo n’ala Igbo, mgbe elu ka bụ ala ọsa, e nwere ụfọdụ akụrụngwa ụda ndị Igbo ji agbasa ozi n’obodo nke gụnyere, ekwe, udu, ogene nakwa Ikoro.
Akụrụngwa ndị a nwere ihe mere ha jiri dị iche n’ibe ha, site n’ụda ha, etu ha n’ukwuu nakwa ihe ndị ọzọ.
N’akụkọ a, anyị ga-elebe anya n’ihe banyere akụrụngwa pụrụiche a na-akpọ ‘Ikoro’.
Ihe bụ ikoro
“A na-arụrụ ikoro ụlọ, ọ na-anaghị anọ n’okpuru anwụ maọbụ mmiri.”
Otu onye ọkachamaara n’omenala Igbo bụ Nze Duruagwu bụ akụrụngwa ụda e ji akpọku ọha mmadụ n’obodo ma oke ihe mee – ma nke ọma ma nke ọjọọ.
O kwuru na ụda ikoro na-ama jijiji n’obi nke bụ na a kụọ ya, onye ọbụla nọ n’obodo ga-anụrịrị ụda ya na-agbanyeghi ebe ị nọ.
Nze Duruagwu kwuru na e nwere ụfọdụ obodo ikoro ha na-ebu oke ibu nke bụ na tupu a kụọ ya, a na-eji ubube arịgoro n’elu ya.
“Ikoro dịka arụnsị, a na-atụrụ ụfọdụ n’ime ha aja tupu a kụọ ya. A na-arụrụ ikoro ụlọ, ọ na-anaghị anọ n’okpuru anwụ maọbụ mmiri.”
Duruagwụ kwuru na ọ bụghị mmadụ niile nwereike ịkụ ikoro na onye ahụ na-akwado ọfụma tupu ọ kụọ ikoro.
“Ọ bụghị onye ọbụla nwereike ịkụnwu ikoro, ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ, onye ahụ ga na-asọ ime ihe ọjọọ nsọ.”
“A na-anaghị akụ ikoro na nkịtị ma o nweghi nnukwu ihe dapụtara maọbụ ozi dị mkpa a chọrọ izi ndị obodo.
“Mgbe ọbụla a kụrụ ikoro, ndị obodo niile na-agbakọta n’etiti ama, iji chọpụta nnukwu ihe ahụ mere nụ.
Ihe e ji ikoro eme
Ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ mmadụ, ọ bụghị mmadụ niile nwereike ịkụ ya
Nze Duruagwu tụrụ ilu sị “ọ na-abụ ekwe kụọ ama agbaa”. O kwuru na ọ bụ ikoro ka e ji eme ihe ndị gụnyere;
- Ịkpọku ọhanaeze obodo ma oke ihe mee maọbụ a chọro ime nnukwu emume n’obodo dịka ichi Eze, Nze na Ọzọr.
- A na-eji ya ekwupụta ọnwụ nnukwu mmadụ n’obodo dịka ọnwe Eze obodo, ọnwụ onye Ichie, Ezemmụọ na ndị ọzọ.
- A na-eji ya akpọ oku agha n’oge gboo.
- E nwereike iji ikoro kpọpụta nnukwu mmọnụ n’obodo, mgbe ahụ a kụọ ya, a na-esi nwaanyị ọbụla maọbụ onye na-etozughi oke ịhụ mmọnwụ ahụ agaghị apụta ezi.
Ndịiche dị n’Ikoro na ekwe
Nze Duruagwụ kwuru na ọ bụ eziokwu na e ji ikoro na ekwe agbasa ozi mana e nwere ndịiche n’etiti ha.
Ikoro buru nnukwu ibu anaghị ebu ya akpagharị akpagharị mana ekwe dị obere.
A na-atụrụ ụfọdụ ikoro aja tupu a kụọ ya mana a naghị atụ aja n’ịkụ ekwe.
Ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ anaghị a họpụta onye ahụ ahọpụta mana e nwereike ịhọpụta onye na-akụ ekwe.
Ihe mere omenala ikoro ji anwụ
“Ikoro dịka arụnsị, a na-atụrụ ya aja tupu a kụọ ya.”
Dịka ọ dị ugbua, omenala iji ikoro agbasa ozi maọbụ ịma ọkwa na-anwụzi anwụ n’ala Igbo ugbua.
Nze Duruagwu kwuru na ihe butere ọnọdụ a gụnyere mbata omenala nwa Bekee butere okpukperechi Kraịst nke mere na ọtụtụ ndị Igbo anaghizi ekwenye n’omenala Igbo.
O kwuru na o meela ụfọdụ na-akpọzi ụlọ ikoro ndị a ọkụ na-emebisi ha, ebe ndị oke ọchịchị na-ezu ikoro ndị a ma na-ere.
Ihe ọzọ bụkwa na tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka nzirita ozi maọbụ ịma ọkwa lazie n’ekwentị nke mere na ọ na-arahụ ịhụ ka ndị obodo niile gbakọtara ọnụ maka mkparịtaụka.
Duruagwụ tụrụ arọ kwuo na ọ ga-adị mkpa ka ndị Igbo legharịa anya azụ ma chọpụta ebe ha si ma makụọ ụfọdụ omenala ndị ha gbahapụrụla bụ nke ikoro so n’ime ha.
Leave a Reply