Take a fresh look at your lifestyle.

Herbert Wigwe: Ihe nyocha e mere kwuru banyere ọnwụ nwamadị a

0 450

Ndị ọrụ mba Amerịka akọwaala otu n’ime ihe ndị butere mberede ụgbọelu helikọpta nke gburu onyeisi ụlọọrụ Access Group bụ Herbert Wigwe, nwunye ya na nwa ya nwoke n’obodo California n’ụbọchị Fraịde.

Ha kwuru na akụkọ si n’ọnụ anya hụrụ ka o si mee kwuru na mmiri nọ na-ezo mgbe ụgbọelu helikọpta ahụ kpọkasịrị.

“Anya hụrụ ka ihe si mee kwuru na ọnọdụ ihe eluigwe mgbe ihe mberede a mere gosiri na mmiri na-ezo, tinyere ijiriji.” Ka ihe otu onye ụlọọrụ na-ahụ maka eje alọ n’Amerịka bụ Michael Graham kwuru.

O kwuru na mmadụ atọ ndị ọzọ so n’ụgbọelu ahụ gụnyere Abimbola Ogunbanjo bụbu onyeisioche ụlọọrụ Nigeria Exchange Group nwụrụ.

Graham gara n’ihu kwuo na otu ha ga-eme ezi nyocha tara ọchịchị iji chọpụta kpọmkwem ihe butere mkpọkasị ụgbọelu helikọpta ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *