Take a fresh look at your lifestyle.

Lee uru ọkwụrụ bara nye ahuike

0 408

Ọkwụru bụ mkpụrụubi bara oke ụrụ, eji ya esi nrị, ọ na enyere kụ aka n’ihe gbasara ahụike.

Ebe ana a hụkaba ọkwụrụ bụ na ọdịda anyanwụ Afrịka.

N’edemede a , anyị ga-elebanye anya n’ụrụ ahụike ọkwụrụ bara.

Ị banye ahịa ndị dị na ọdịda anyanwụ Afrịka, ị ga ahụrịrị ebe akpọsara ọkwụrụ.

N’agabanyere na ọkwụrụ bụ ihe ejiri mara Afrịka, mba ndị ọzọ na aku kwa ya.

India bụ mba kachasị akọpụta ọkwụrụ, ha na akụpụta ihe ruru ọgụ ọkwụrụ 6,126,000 gba afọ.

Osote ha bụ Naịjirịa na akọpụta 2,033,129 kwa afọ ebe Sudan na akọpụta ọkwụru ruru 304,712 kwa afọ.

Gịnị bụ Ọkwụrụ?

Ọkwụrụ bụ mkpụrụubi ana-eri dịka akwụkwọ nri, ọkachasị na mba Afrịka.

Mkpụrụubi a na-abia n’ụdị dị icheiche. Ihe dị iche na -adị na akwụkwọ ya, mkpuru ya,osisi na etu osi a ha.

Enwere ndị dị mkpụmkpụ nwee ndị dị elu. Ndị mkpụmkpụ anaghị anọte aka tụpụ ha nwụọ, mkpụru ha mitara na anọ ọnwa atọ tụpụ ọchaa, ndị nke dị elu anaghị anwụ ọsọ, mkpụru ha na anọ ọnwa isii ruo ọnwa itolu tupụ ọchaa.

Enwere ndị na-acha redi nwekwa ndị na-acha ‘green’, ogologo ọkwụrụ bu ihe ọzọ na-adị ịche, ogologo ha na anọ n’agbata 5 na 20 ‘cm’.

Etu ogologo ha siri dị iche ka ihe nọ ha n’ime siri dị iche.

Ihe ndị ọkwụrụ na-arụ na-ahụ

Onyeisi ‘NutriMali Association’ bụ Mamadou kwuru na ọkwụrụ nwere ọtụtụ vitamins na minerals nọ ya n’ime, ụfọdụ bụ vitamin B2,B3,B6,B9,vitamin C na vitamin K.

Ọkamụta nri mba Ivory Kọst bụ Marion Ezzedine, kwuru na Ọkwụrụ nwere ihe ọ na enye na-ahụ na-enwete ahụike site na ị me ka mmadu hapụ ịka nka ọsọ.

Onye chọrọ ị ta ahụ chọba ọkwụrụ maka na ọ ga enyere ya aka.

Ọkwụrụ na-enyere aka na ịgbari nri. Ezzedine kwuru na ọ na enyere aka agbali oke abụba dị n’ahụ mmadụ.Ọ na enyere ọkpụkpụ aka.

Eji ọkwụrụ egbii ọgwụ mkpọrọgwụ eji agwọ ọrịa dị icheiche.

Enwereike iji ya gwọ ọrịa ihe nwụkasị ihe n’arụ mmadụ ana-akpọ ‘nodules’ n’ọlụ bekee, Dọkịta Bah Seydou Mamadou kwuru.

Nyocha gosiri na-enwere ihe dị na ọkwụrụ nwereike i mee ka ejiri ya rupụta ọgwụ ga agwọ ọrịa kansa, nje na ọbara mgbalielu.

Akwụkwọ nyocha sayensi Agregan na ndị otu ya dere kọwara nke.

Kedu etu i ga esi mee ọkwụrụ ka i rite ụrụ dị na ya?

Enwere nri dị icheiche eji ọkwụrụ esi na mpaghiara Afrịka.

Ana esi ya n’mmiri ọkụ, a na-eri ya na-esighị ya n’ọkụ, eji ya esi ofe.

Na Senegal, eji ya esi nri ha na-akpọ ‘soupou kandja, na ‘Cote d’Ivoire, eji ya esi nri akpọrọ ‘okoro sauce’.

Ndị Kameroun na ndị Benin nwere ‘okra sauce’ nke ha.

Na mba Guninea Repụblịk, ọkwụrụ so n’ihe ndị eji e si ‘foutti’ bụ nri ha ji ọtụtụ akwụkwọ nri esi.

Dọkịta Ezzedine kwuru na ọkwụrụ na aka enye ihe n’aru ma erie ya na-esighị ya n’ọkụ n’agbanyere na ọ ga ahia-arụ ilo (ọkachasị vitamin c).

Ọkammụta Mamadou Seydou nyere ndumodu ka ha kwụsị isitee ọkwụrụ aka, si a hapụkwa na ya ka ọ nọ tee aka n’anwu.

‘’Ọkwụrụ enwere ihe dị naya na-enyere aka alọ ofe’’ ọkammụta Ezzedine kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *