Take a fresh look at your lifestyle.

Awụsala m ọwa n’ịzọ ọkwa Onyeisiala mba Amerịka ma kwadoo Trump – Ron DeSantis

0 285

Gọvanọ Florida bụ Ron DeSantis akagbuola atụmatụ ya n’izọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka n’afọ 2024 ma kwadoo Donlad Trump.

O mere mkpebi a dịka pati Republican na-akwado ime ntuliaka imeụlọ na New Hampshire, dịka ọ na-enwetere akara.

DeSantis bụ onye a hụtara nwereike ime ọfụma na ntuliaka ahụ pụtara n’ụbọchị Sọnde kwuo na “ọ hụtaghị onwe ya dịka onye ga-emerinwu na ntuliaka ahụ”.

Otu onye ọzọ fọrọ na-ama Donlad Trump aka n’ihu bụ Nikki Haley kwuru na ọ bụ “naanị ya” nwereike imerinwu Joe Biden bụ onyeisiala mba Amerịka.

Nwada Haley na Donald Trump ga-aga n’ihu ịmaka na ntuliaka imeụlọ ahụ na New Hampshire n’ụbọchị Tuzde, iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ndị Republikan zọọ ọkwa onyeisiala n’ọnwa Nọvemba.

N’ihe onyonyo o wepụtara n’akara X bụbu Twitter n’ụbọchị Sọnde, DeSantis kwuru na ndị ọchụnta vootu ya “ahapụla ihe niile n’ọgbọegwuregwu”.

Ọ gara n’ihu kwuo na ihe mere o ji akwado Trump na-agbanyeghi nghọtahie ha na-enwe bụ maka na ọ ka Joe Biden mma, tinyekwara na ọtụtụ ndị pati ha chọrọ inye Trump ohere nke abụọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *