Take a fresh look at your lifestyle.

Ndi uweojii anwụchiela nwoke ji aka ya hazịe ntọ onwe ya

0 222

Ọnụ na-ekwuru uweojii Abuja bụ Josephine Adeh, gwara ndi ntaakuo na ọ bụ eziokwu na otu nwoke aha ya bụ Nnandi Agu’m’ ji aka ya hazie ntọ nke ya, o kwuru na ha anwụchịla nwoke ahụ.

Dịka Josephine siri kwu, nwanne Nnandi kpọrọ ụlọọrụ uweojii Abuja ụnyaahụ bụ abali iri abuo nke onwa Jenụwarị 2024, mkpesaara ha na atọrọọla nwanne ya nwoke n’ebe akpọrọ ‘River Park Estate’ dị n’Abuja.

Ka ndị uweeoji malitere nyocha, ha chopụtara na onweghị onye tọọrọ Nnandi, kama nwamadi ahụ ji aka ya hazie ntọ onwe ya iji napụta nwanne ya nwoke bi na-ebe ahụ ago.

N’ okwu ya, ‘‘Anyị anwụchiela nwoke ahụ ji aka ya hazịe ntọ onwe ya, anyị ga agba ya ajụjụọnụ, dịka anyị na-eme nyocha a, anyị ga-eme ka ọha mata ihe anyị chọpụtara mere nwoke a jiri mee ihe ọmere’’

Josephine gwara ntaakuko na ezinaụlọ nwoke ahụ rịọrọ ndị uweojii ha belata aka na mgbasa ozi ahụ maka na ọbụ ihe ihere nyere ezịnaụlọ ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *