Take a fresh look at your lifestyle.

Nke bụ eziokwu banyere ọrịa di m na-arịa – Nwunye Amaechi Muonago

0 403

Ezinaụlọ onye a ma ama na-eme ejije Nollywood bụ Amaechi Muonago ekwuola na nwamadị ahụ nọ na nnukwu ụlọọgwụ ugb a na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa dị icheiche.

Nke a na-esote akụkọ gbara na soshal midịa gbasara ahụike nwamadị ahụ nke ụfọdụ kpọpụtara ọrịa dị icheiche ọ na-arịa.

Muonago abụrụla onye ọzọ so na ndị na-eme ejije na Nollywood dara nnukwu ọrịa na nso nso a.

Na mkparịtaụka ndi ntaakuko na nwunye Muonagọ bụ Chikaodi Muonago nwere, o kwuru nke bụ eziokwu kpọmkwem ọrịa ndị ọ na-arịa.

Chikaodi gwara ndi ntaakuko na ihe na-arịa di ya bụ Amaechi bụ ọrịa akụrụ nke bụ Kidney na Bekee na ọrịa suga. O kwuru na ọrịa suga ahụ eteela aka ọ na-arịa ya mana a chọpụtara ọrịa akụrụ ahụ n’ọnwa Julai afọ a bụ 2023 bụ oge ha malitere nke a na-akpọ ‘dialysis’ na Bekee.

‘Dialysis’ a pụtara iji igwe na-ekpochapụ atịtị dị mmadụ n’ime ahụ ebe akụrụ onye ahụ anaghị arụnwuzi ya bụ ọrụ n’onwe ya. Muonago malitere ya bụ mkpochapụ n’ọnwa Julai.

Mana nke meziri ugbua dịka nwunye Muonago siri kwuo bụ na Amaechi nweziri mkpọnwụ ahụ nke metụtara aka ekpe ya na ụkwụ ya mere na ọ naghị agalizi ije, a na-ebuzi ya ebu.

N’okwu ya: “Mkpọnwụ ahụ a bịara, anyị amaghịkwa ihe kpatara ya, o mere ya n’otu ụkwụ na aka ekpe ya.”

Mana dịka ihe gbasara ọrịa akụrụ ahụ, Chikaodi kwuru na ọ na-ebelatazi ya maka na di ya na-agazi mkpochapụ atịtị n’ime ahụ ya naanị otu ugboro n’izuụka ugbua na-abụghịzi ugboro abụọ ọ na-agabụ.

Cheta na otiegwu a ma ama bụ Tony One Week nke ezigbo aha ya bụ Tony Muonago dere ihe gbasara ahụike deede ya bụ Amaechi na peeji ya na Facebook nke mere ụwa ji kpụrụ okwu ahụ n’ọnụ.

Etu ọ dị ugbua, Amechi ka nọ n’otu nnukwu ụlọọgwụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjịrịa na-anata ọgwụgwọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *