Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mberede gwongworo egbuola ọtụtụ mmadụ

0 172

Mmadụ iri abuo na ise anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ mere mgbe ụgbọala gwongworo bu pụrụ na gear were kpọkasịa n’okporoụzọ na Niger steeti.

Gwongworo ahụ si Sokoto a ga Legọs bukarịrị mmadụ na ngwongwo ma na-efe speed nke mere ka ọdachi a mee dịka ndị ọrụ okporoụzọ si kwu.

E kwukwara na ọnụọgụgụ ndị nọ n’ime ya bụ ụgbọala ukwu karịrị nari abuo dịka ndị merụrụ ahụ nọ n’ụlọogwụ anata ọgwụgwọ.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ bụ nnukwu ihe mwute ma nye iwu ka ndi ọrụ gbatagbata nye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwọ zuruoke.

Gọvanọ steeti Niger bụ Mohammed Bago enyela iwu ka a kwụsị iji gwongworo e ji e bu ibu e bu ndi mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *