Take a fresh look at your lifestyle.

A chụọla ‘Home Secretary’ nke mba Briten , Suella Braverman n’ọrụ

0 264

Praim Minista mba Briten bụ Rishi Sunak achụọla Suella Braverman bụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n’ụlọ.

Nke a na-abịa dịka Braverman katọrọ ndị uweojii mba ahụ, boo ha ebubo ile anya n’ihu na-etu ha si emeso ndị na-eme ngharịiwe banyere ihe na-eme n’etiti Izrel na Palestine bụ ebe agha na-ada ugbua.

E boro Braverman ebubo ịmụnye ọhụ site n’ihe o dere n’akwụkwọ akụkọ dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-akwado ime ngagharịiwe ịkwado ndị Palestine.

A kpọpụtaghị onye ga-anọchi Braverman.

Cheta na Braverman, onye India a mụrụ na Briten arụbuola ọrụ dịka mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n’ụlọ malite n’abalị isii nke ọnwa Septemba 2022 rue abalị 19 nke ọnwa Oktoba 2022 n’okpuru ọchịchị Praim Minista Theresa May tupu ọ gbaa arụkwaghịm n’ihi okwu metụtara Brexit.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *