Take a fresh look at your lifestyle.

 Ndị agha na ndị uwe ojii napụtara mmadụ abụọ a tọọrọ na steeti Katsina.

Nokai Origin, Abuja.

0 286

Onye ntụzịaka, mgbasa ozi ọha na eze ndị agha, Brigadier General Onyema Nwachukwu, kwupụtara na ndị agha 17 Brigade Nigeria na nkwado ndị uwe ojii agbapụtala mmadụ abụọ ndị ohi tọọrọ na obodo Yargoje, n’okpuru ọchịchị Kankara na steeti Katsina.

O kwuru na mbọ ndị ọrụ nchekwa mere ka ewepụtara ndị ahụ a tọọrọ n’ike wee weghachi ha n’otu ọrụ na Tọzdee 2 Nọvemba 2023.

A tọọrọ ndị otu Corps ahụ ka ha si Edo na-aga  steeti Kastina.

“E nyela ndị otu a gbapụtara agbapụta nlekọta ahụike na nkwado dị mkpa iji hụ na ahụ ha dị mma .Ha nọrọ ugbu a n’aka ndị uwe ojii Naijiria na Kankara.

“Ndị agha Naijiria na-aga n’ihu na-arịọ nkwado  nke ọha na eze n’inye ozi n’oge na nke dị mkpa iji mee ka ndị agha na-arụ ọrụ ngwa ngwa were na-ejide  ndị omempụ na-eyi nchebe obodo egwu.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *