Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Charles Okafor na ya alọghachila ọzọ.
- Onye bụdị Charles Okafor?
Charles Okafor bụ onye ejije Nollywood a ma ama nakwa onye na-ahazi ejije.
Ọ chawapụtara n’agbata afọ 1995 na 2000 dika o sonyere n’ụfọdọ ejije wuru ewu dịka Igodo, Oracle , Domitilla na ndi ọzọ.
- O sonyela n’ihe ejije karịrị 200.
- O mepụtala ọtụtụ ihe ejije gụnyere Omalinze,The Proposal, Dust
- O nwere ụlọọrụ na-emepụta ihe onyonyo a kpọrọ C&E Productions
- Ọ bụ onye Umuleri,Anambra steeti mana o toro na Ajegunle ,Legọs
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum ‘University of Port-Harcourt
- Ọ rụrụ ọrụ na Security and Exchange Commision nwa oge tupu ọ banye
E mechara ihu ya kọwa ụkọ na Nollywood.
Akụkọ fesara na soshal midia bụ na ọ ghọọla ụkọchukwu nke mere o jiri hapụ ị na-emezi Ihe ejije.
O kwuru na ya bụghị ụkọchukwu.
O kwukwara na ya alọghachila ọzọ.
bbc>igbo
Leave a Reply