Take a fresh look at your lifestyle.

(NDIC)etoola ndị ọka ikpe maka mbọ ha.

Elizabeth Christopher dere ya na bekee.

0 320

(NDIC) Nigeria Deposit Insurance Corporation etoola ndị ọka ikpe maka mbọ ha  iji wepụta usoro dị mma na ngalaba mkpuchi nkwụnye ego site na usoro ikpe ziri ezi.

NDIC kwuru na nghọta ka mma nke ngalaba ọrụ mkpuchi ego nkwụnye ego, ndị ọkàikpe nwere ike inye aka mee ka ntụkwasị obi ndị nkwụnye ego sikwuo ike site na usoro ikpe ziri ezi dị mma ma , si otú a na-akwalite nkwụsi ike na usoro ego nke mba a.

Mr. Bello Hassan, bụ onyeisi NDIC nyere otuto ahụ n’okwu nnabata ya na 2023 Sensitization Seminar, nke Ụlọ ọrụ a haziri na mmekorita ya na National Judicial Institute (NJI) maka ndị ọka ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke isi ala anyi . N’ isiokwu ya. : “Na-eme ka ntụkwasị obi nke ndị na-etinye ego na ụlọ akụ na ụlọ ọrụ ego ndị ọzọ ghara ida mba.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *