Ndị ọkachamara na-arụkọ ọrụ ọnụ kwuru ka akwụsị ịṅu ogwu etu ekwesighi ekwesi na Naijiria.
Bitrus Kozah dere ya na bekee.
Ndị ọkachamara na-arụkọ ọrụ ọnụ kwuru ka akwụsị ịṅu ogwu etu ekwesighi ekwesi na Naijiria.
Onye isi oche nke National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), General Buba Marwa RTD, bụ onye mere nkwupụta a na Nigerian Society of Substance Use Prevention and Treatment Professional na Abuja, isi obodo Naijiria.
O kwuru, “Ihe dị ka nde mmadụ 14.3 ndị Naijiria nọ n’agbata afọ iri na ise na iri isii na anọ bụ nwere nsogbu uche maka na ha nụrụ ọgwụ n’uzo ekwsighi ekwesi.”
Onye isi otu ndị ọkachamara na-ahụ maka mgbochi na ọgwụgwọ nke Nigeria Society Dr. Martin Agwogie kwuru na yana ndị ọkachamara n’ebe ahụ ga-eweta mbelata nke ukwuu nke ịṅụ ọgwụ n’uzo ekwesighi ekwesi..
O kwuru na ọ dị mkpa iwebata mmemme riri ahụ na ụlọ akwụkwọ mmụta dị elu nke na-achọ ibelata iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.
Onye isi okwu, Prọfesọ Mosses Audu onye kpọrọ oku maka itinyekwu aka site na imekọ ihe ọnụ kwuru na ịṅụ ọgwụ ọjọọ bụ omume omume nwere ike ịgwọta.
Ndị ọzọ na-etinye aka na mbelata ọchịchọ ọgwụ na-etokwa mkpa ọ dị iji hụ na mbelata ọgwụ na ọgwụ na ọha mmadụ n’ihi nnukwu ọchịchọ na oriri zuru ụwa ọnụ.
Leave a Reply