Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Kasị Elu na-edobe Mọnde maka mkpesa Atiku na-ama mmeri onyeisiala Tinubu aka.

chigo

0 254

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịaehiwela ụbọchị Mọnde 23 Ọktoba dịka ụbọchị ọ ga-eleba anya n’akwụkwọ Atiku Abubakar nke PDP gbara ka a kagbuo mmeri Bola Tinubu nke APC na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

Ụlọikpe a ga-anọkwa n’ụbọchị ahụ leba anya na mkpesa Atiku nyere ka e nye ya ohere iwebata ihe akaebe ọhụrụ iji gosi na Tinubu ji asambodo adịgboroja nke o nyere ụlọọrụ Inec iji zọọ ọkwa a.

N’ozi ụlọọrụ ntaakụkọ Channels hụrụ kwuru na ikpe ahụ ga-amalite n’elekere itoolu nke ụbọchị ahụ bụ ebe ndị ọkaiwu Atiku na Tinubu ga-awụchi n’ihu ndị ọkaikpe asaa iji kwupụta mkpesa ha na ọsịsa ha.

Ndị ọkaiwu Inec na Tinubu ga-agbakọta aka ọnụ ịrụrịtaụka ma iwu megidere ụlọikpe kachasị ịnabata akaebe ọhụrụ n’ikpe ụlọikpe mkpegharị kpere na mbụ.

Akwụkwọ akaebe Atiku chọrọ igosi ụlọikpe a bụ nke asambodo agụmaakwụkwọ Tinubu bụ nke mahadum steeti Chicago nyere ya na mba Amerịka n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.

Ọ bụ ụlọikpe mpaghara Illonois nke mba Amerịka nyere mahadum a iwu ka ha nye Atiku asambodo Tinubu dịka ihe akaebe.

bbc igbo

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *