Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ steeti Kogi bụ Yahaya Bello adụọla ndị na-akwado otu APC ka ha gbanahụ ọgbaghara.

Chigo deziri ya n'Igbo.

0 159

Gọvanọ steeti Kogi bụ Gọvanọ steeti Kogi bụ Yahaya Bello adụọla ndị na-akwado otu APC ka ha gbanahụ ọgbaghara. Yahaya Bello adụọla ndị na-akwado otu APC ka ha gbanahụ ọgbaghara, n’ihi na pati ahụ nwere ezigbo onye ga-azọ ọkwa gọvanọ bụ Usman Ododo maka ntuliaka gọvanọ  a ga-eme n’abalị iri na otu n’ọnwa Nọvemba.

 

Bello onye kwuru  nke ahụ na Kabba na Satọde na nnọkọ mgbasa ozi nke pati ahụ ebe o gosipụtara nchekwube na APC na Ododo ga-emeri ntuli aka site na nkwado Chineke.

 

“Emegbula onye ọ bụla n’ọsọ a n’ihi na anyị nwere ezigbo onye na-azọ ọkwa gọvanọ onye dika Usman Ododo, onye site n’amara Chineke ga-emeri ntuli aka nke Novemba .

 

“Anyị na-enyefe ọdịnihu Kogi n’aka Ododo na onye ya na ya ga-eso zọọ ọchịchị, n’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị njikere ịnapụta ha n’ụbọchị ntuli aka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *