Take a fresh look at your lifestyle.

PDP dọrọ aka ná ntị megide ndi hibere isi n’okpukpe, echiche agbụrụ na steeti Nasarawa.

Amina Mohammed, Lafia.

0 219

PDP dọrọ aka ná ntị megide ndi hibere isi n’okpukpe, echiche agbụrụ na steeti Nasarawa.

Ndi otu PDP na steeti Nasarawa adọọla ndị steeti ahụ aka na ntị megide ihibe isi n’echiche okpukperechi na agbụrụ nke na-akpata imebi udo na ịdị n’otu nke ndị mmadụ.
Onyeisi otu ahụ bụ Daniel Agbo kwuru nke a mgbe ọ na-enwe mkparịta ụka n’ụlọ ọrụ nta akụkọ NUJ dị na Lafia, isi obodo steeti ahụ.
Ọ na-akpọku ọha na eze ka ha ghara ịghọgbu na ighasa ndọrọ ndọrọ ọchịchị steeti site n’ ịkpata ọgbaghara, nke na-adịghị mma maka mmepe steeti ahụ.
“Anyị na-adọ ndị ọha na eze aka na ntị, karịsịa ndị otu ka ha kpachara anya .
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ihe nwute na ụfọdụ n’ime okwu ndị a sitere n’aka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị isi okpukpe anyị chere na ha gana eweta udo.
Ya mere Agbo na-akpọku ndị otu ya ka ha hapụ ihe ndị dị otu a maka uto na mmepe obodo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *