Take a fresh look at your lifestyle.

Divine Oduduru eritela mmachi afọ isii maka ịda iwu abụo gbadoro ụkwụ n’ọgwụike.

chigo.

0 496

Ọgbaọsọ mba Naịjirịa bụ Divine Oduduru eritela mmachi afọ isii maka ịda iwu abụo gbadoro ụkwụ n’ọgwụike.

Ngalaba Athletics Integrity Unit kwuputara nke a n’ụbọchị Tọzde kwuru na o nwere ihe akaebe karịrị akarị megidere Oduduru.

Ebubo abụọ e boro ya gụnyere ijide ọgwụ ndị amachiri amachi.

Okwu Oduduru na nke Blessing Okagbare bụ onye amachiri afọ iri na otu n’afọ 2022 nwere ebe ha jekọrọ.

Cheta na amachibuola Oduduru obere oge n’ọnwa Febụwarị afọ 2023 ganye mgbe a ga-emecha nyocha banyere ebubo ndị e boro ya.

A chọpụtara akụkọ ya dịka e bochara Eric Lira ebubo ịnye ndị na-agba ọsọ ọgwụ ga-enye ha ike n’Olympic nke Tokyo.

Lira nwereike ị ga nga afọ iri ma ikpe maa ya dịka o kwetara na o mere ihe ndị a.

Achụpụrụ Okagbare n’asọmpị Olympics tupu a gbaa ọsọ nke ụmụ nwaanyị 100m dịka ọ pụtara ihe na achọtara ọgwụike n’ahụ ya n’otu nyocha e mere na Slovakia n’egwuregwu ndị ahụ nke afọ 2020.

A chọtakwara ọtụtụ ozi ekwentị Whatsapp jikọrọ Okagbare na Lira gosikwara na Okagbare na-achọ ọgwụ n’aka Lira ị nye Oduduru.

Oduduru na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha n’ihe a niile.

BBC IGBO.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *