Ndị agha iri na ise na ndị ọzọ anwụọla na mwakpo Jihad na mba Mali.
chigo dere ya n'igbo,
Ndị agha iri na ise na ndị ọzọ anwụọla na mwakpo Jihad na mba Mali.
Ndị agha Jihad nke okpukperechi Islam awakpoola ụgbọmiiri na mpaghara ugwu Mali ma gbuo ihe ruru mmadụ 49 ka gọọmentị kwuru.
N’otu aka ahụ ha wakpo kwara ogige ndị agha ebe ha na ndị agha kwakọtara ya ma gbuo mmadụ 15 dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha Jihad ahụ ruru 50 nwụrụ na ya.
Nke a mere ka gọọmentị mba ahụ manye ụbọchị atọ a ga-eji ru ụjụ maka ndị nwụru nakwa mwakpo ndị ahụ mere.
Cheta na gọọmentị mba ahụ na-ekwu na otu Wagner na-enyere ha aka n’ịlụsọ ndị ahụ agha mana mmaja si n’aka ndị agha Jihad ahụ ka na-abawanye.
.A wakporo ụgbọ mmiri ahụ dịka ọ na Niger si n’obodo Gao na-aga Mopti bụ ebe enweghi okporoụzọ ziri ezi.
BBC, IGBO
Leave a Reply