Take a fresh look at your lifestyle.

Ime ndị dibia lara ezumike nka, ndị ọrụ ahụike :Steeti Cross River.

chigo tapiaara ya n'Igbo.

0 416

Ime ndị dibia lara ezumike nka, ndị ọrụ ahụike :Steeti Cross River.

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Cross River, Dr Henry Ayuk, na-ekwu na ịla ezumike nka n’iwu nke ndị ọrụ obodo ka afọ iri atọ na ise gasịrị na-Enye nsogbun  n’ọrụ ahụike.

Kọmishọna  ahụ, onye kwupụtara nke a n’oge  mkparịta ụka na Calabar, kwughachiri na gọọmentị steeti ahụ na-atụle itinye ndị nọọsụ, ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ bụ ndị kwesịrị ịla ezumike nka n’afọ a n’ ọrụ.

O kwuru na, “Ndị nọọsụ na ndị dọkịta nwere ike  ịmaliteghachi ọrụ bụ ndị ka na-arụsi ọrụ ike na ndị bara uru na usoro ahụ ma nwee ndekọ dị mma nke ọrụ.”

Ayuk rụtụrụ aka n’ihe atụ otu dọkịta nọ n’ụlọọgwụ General Ogoja bụ onye kwesiri ịla ezumike nka ọnwa atọ gara aga, mana gọvanọ steeti ahụ anabataghị ezumike nka ya n’ihi na o nweghị onye nọchiri anya ya.

Ọ kọwara na ụfọdụ ndị nọọsụ na-ala ezumike nka n’afọ a erubeghị afọ iri ise, n’ihi na ụfọdụ n’ime ha malitere ịnata ụgwọ ọnwa mgbe ha tinyere ha n’ụlọ akwụkwọ nọọsụ n’afọ iri na ụma, na-agụkwa afọ ndị a dị ka afọ ọrụ.

Ọ kwara arịrị na n’ime ụlọ ọgwụ izugbe 18 dị na steeti ahụ, enwere naanị ndị dọkịta iri na asatọ, na n’ụlọ ọgwụ ụfọdụ, naanị otu dọkịta na-enye ọrụ awa 24, nke na-adighi mma.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *