Take a fresh look at your lifestyle.

A na-agba gọọmenti steeti Gombe ume inye ụmụ nwanyị ndị ọrụ ugbo ike.

Chigo tapiara ya n'Igbo.

0 483

A na-agba gọọmenti  steeti Gombe  ume inye ụmụ nwanyị ndị ọrụ ugbo ike.

Small-Scale Women Farmers Organisation in Nigeria (SWOFON),   nke steeti Gombe , akpọkuola gọọmentị steeti ka ha nye ụmụ nwanyị ike n’ọrụ ugbo yana ndị ntorobịa iji kwalite nchekwa nri na steeti na obodo.

Onye isi oche steeti ahụ, nke SWOFON, Oriakụ Airudia Mamman, kpọrọ oku a na Gombe na Tọzdee na ngwụcha nzukọ ndụmọdụ ndị otu a ụbọchị ha mere usoro ha ga-eji mmefu ego ọrụ ugbo nke 2024.

Mamman kwuru na site na nkwado dị otú ahụ a ga-edobe ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa n’ọnọdụ ka mma iji ike ọnụọgụgụ ha kwalite nchekwa nri, mepụta ọrụ na ịkwalite ego nke ndị ọrụ ugbo obere na steeti ahụ.

Dị ka ya si kwuo, ndụmọdụ bụ isi sitere na nzụkọ ahụ bụ mkpa maka ịnye usoro mmefu ego n’ime mmefu ego ọrụ ugbo iji kwado ndị ntorobịa ma gbaa ha ume ka ha were ọrụ ugbo dị ka ọrụ.

Otu ahụ gwakwara gọọmentị steeti ahụ ka ha wepụta usoro na-enyere aka na gburugburu ebe obibi na usoro amụma iji mee ka ndị ọrụ ugbo na-azụ obere obere ọkachasị ụmụ nwanyị, ndị ntorobịa na ndị ọrụ ugbo nwere nkwarụ nwee ike nweta kredit na ọmụrụ nwa otu nkeji.

“Ekwesịrị ibute ụzọ maka ndị inyom na ndị ntorobịa n’ọrụ ugbo. Ọzọkwa, a ga-enwe nkwụghachi ego nke ego ndị a n’oge, gụnyere ntinye aka enyere aka dị ka fatịlaịza (organic na inorganic). Ekwesịrị inwe ndokwa zuru oke maka kredit na mbinye ego maka ọkachasị ụmụ nwanyị ndị ọrụ ugbo na ndị ntorobịa obere; nke a ga-eme ka mmepụta ha dịkwuo ukwuu, n’ihi nke a, nri zuru oke, nchekwa na ọrụ onwe onye.

“Ekwesịrị ịkwado mmemme mmepe ọrụ ugbo nke Steeti Gombe  nke ọma

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *