Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị steeti Abịa amalitela ikụrụ ụlọ na ewumewu ndị gbajọrọ iwu

chigo.

0 331

Gọọmentị  steeti Abịa amalitela ikụrụ ụlọ na ewumewu ndị gbajọrọ iwu n’Okpuru Ọchịchị anọ na steeti ahụ ụbọchị Wenezde.

Nkwatu ụlọ obibi,ọdọahịa, ọdọ mmanụ ụgbọala na ewumewu ndị ọzọ nke ndị Odeakwụkwọ Ukwu Okpuru Ọchịchị hụrụ maka ya mere n’ Okpuru Ọchịchị Osisioma, Aba North, Aba South na Obingwa.

Onye ntaakụkọ anyị gara hụ etu ya bụ ihe siri gaa kwuru na ndị ọrụ gọọmentị ahụ gbachiri ọdọ mmanụ ụgbọala a ma ama n’Onwuka Nails dị n’ Okporoụzọ Awara Awara si Aba gawa Enugwu na Potakọt maka iwu ewumewu na anataghị ikike.

A gbachikwata ọdọ Gaasị dị nokporoụzọ ‘Udeagbala Road’ maka na e wuru ya n’elu ọgboroigwe mmanụ ụlọọrụ NNPC nakwa ọdọ gaasị dị n’ Immaculate, ebe Waterside bụ nke agbachiri maka ịdị n’okporo ụgbọ oloko.

A gbachikwara ọdọa ahịa dị 26 bụ ndị a rụrụ n’okpuru nnukwu na nso ụlọụka ‘Saint Silas Anglican Church, Ayaba-Umueze ‘ maka ịdị ebe dị njọ mmadụ ịnọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *