Mịnịsta na-elekọta mpaghara ‘Federal Capital Territory’ bụ Nyesom Wike ekwuola na a ga-ejichi onye nwe ụlọelu ogogo abụọ nke dara na mpaghara Garki, Abuja n’abalị ụbọchị Wenezde, Ọgọst 24.
Wike kwuru nke a dịka ọ gara na mpaghara ebe ụlọ ahụ dara n’ụtụtụ ụbọchị Tọzde, iji were anya ya hụ etu ọdachi ahụ si mee.
O kwuru na ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ maọbụ tụfuo ndụ ha n’ọdachi ahụ, ma kwe nkwa na gọọmentị ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị e bugara ụlọọgwụ.
Wike gara n’ihu kwuo na gọọmentị ga-akụtu ụlọ ndị dị na mpaghara ma megharịa okirikiri ahụ ka ọ kawanye mma.
“Mgbe gọọmentị na-ekwu na a ga-akụtu ụlọ ndị esighi ike, maọbụ ndị ejighi akụrụngwa siri ike rụọ, ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ mmekpa ahụ ka gọọmentị na-emekpa ha, mana ọ bụ iji gbochie ụdị ọadachi dị otu a,” Wike kwuru.
“Ọ bụrụ na ọ bụghị maka Chineke, ndị nwụrụ ebe a gaara ịdị ọtụtụ. Anyị ga-achọta ma jichie onye nwe ụlọ a.
”
Ndị ọrụ gbatagbata nke ngalaba ‘Federal Capital Territory’, Abuja, ekwuola na e bupụtala ozu mmadụ abụọ n’ime ụlọ elu dara ada na mpaghara Garki, n’Abuja n’ụtụtụ Tọzde a.
Ndi bi okirikiri ahụ kwuru na ụlọelu ahụ dara n’ebe elekere 11 nke abalị ụbọchị Wenezde dịka nnukwu mmiri na-ezo.
Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata a kpọrọ ‘FCT Emergency Management Authourity’ (Fema) bụ Abbas Idriss, gwara ndị ntaakụkọ na ha malitere ọrụ nzọpụta ndị mmadụ tọrọ n’ụlọ ahụ na-egbughị oge ọbụla.
“Ka ọ dị ugbua, a zọpụtala mmadụ 37 n’ime ụlọ ahụ, ebe mmadụ abụọ nwụrụ anwụ,” Idriss kwuru.
bbc igbo
Leave a Reply