Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere ụfọdụ ndị otiegwu n’Ọwụwa Anyanwụ anaghị apụtacha ihe – Ugochi.

CHIGO.

0 544

Ihe mere ụfọdụ ndị otiegwu n’Ọwụwa Anyanwụ anaghị apụtacha ihe – Ugochi.

Iti egwu so na nka pụrụ iche e ji mara ụmụ Naịjirịa n’akụkụ ụwa niile.

Na Naịjirịa ugbua, ndị otiegwu a kacha anụ aha ha gụnyere Burna Boy, Wizkid, Davido, Temz, Tiwa Savage na ọtụtụ ndị ọzọ.

E nwekwara ọtụtụ ndị si mpaghara Ọwụa Anyanwụ Naịjirịa bụ ndị egwu ha gazurula ụwa, dịka Flavour, ụmụ ejima a na-akpọ P-Square, Phyno, na ndị ọzọ.

Mana Ugoccie – onye ezigbo aha ya bụ Ugochi Anosike – esorola ugbua na ndị aha ha na-ada ụda n’iti egwu na Naịjirịa.

, Ugochi kọwara ihe mere o ji dị ka ndị otiegwu si Ọwụwa Anyanwụ anaghị apụtacha ihe ka ndị ogbo ha nọ na ndịda Anyanwụ Naịjirịa, ọ kachasị na Legos.

 

O kwuru na iti egwu na-ewe nnukwu ego iji mee ka egwu gị pụta bụrụ ihe mmadụ niile ma, mana ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo enweghị ụdị egwu ahụ.

“Ọtụtụ oge, ị gbakọọ ego ị ga-eji wepụta egwu gị ka ụwa nụ ya, ọ ga-erukwa ego mmadụ nwereike iji zụta ala ise n’ebe mepere emepe,” Ugochi kwuru.

“Ọtụtụ ndị ọgaranya anaghị ekwe ewepụta ego buru ibu etu ahụ tinye n’isi otu onye otiegwu, kama ha nwereike ịpụta na-abọ gị ego mgbe ị na-agụ egwu, mana ọ na-ara ha ahụ inye gị ego ahụ na nnukwu ka i were bupụta onwe gị.”

Ugochi nyere ndụmọdụ ka ndị na-eti egwu were akara soshal midia ha kpọrọ mkpa, “maka na ọ bụ ebe ahụ ka ụwa nwereike isi hụ ihe ị na-eme, nke nwereike iwetara gị ndị nkwado”.

BBC IGBO

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *