Take a fresh look at your lifestyle.

Ego ole ka ịmụ nwa n’ulọọgwụ na-ada.

chigo.

0 277

Ego ole ka ịmụ nwa n’ ulọọgwụ nna-ada ugbu a na Naijiria
Otu n’ime ihe ndị kachasị adị ndị mmadu na mpaghara Afrịka mkpa ha ji alụ nwaanyị maọbụ di bụ ịmụta nwa.
Nke a pụtara ihe na aha ha na-agụ ụmụaka: Nwabụeze, Nwamaka dgz,
Ya mere ekpere ọmụmụ so n’ihe na-abụ isiokwu na mmemme alụmdinanwunye n’ala Igbo.
Mana ị ma na dịka ọnọdụ akụnaụba Naijiria dị ugbua, okwu ịmụ nwa bụ egwu onye ọ kara obi, ọ bụghị ọgụ a gba aka alụ.

Nke a bụ n’ihi ọnụahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe e ji amu ma zulite nwa arịala n’elu ọjị.
Dịka ngụkọ nke ụlọọrụ ‘National Bureau of Statistics’ (NBS)si kwuo, ọnụahịa ihe na-ada n’ahịa nke Bekee kpọrọ ‘inflation rate’ ji pasent 4.19 karịa ihe ọ bụ na Juun afọ gara aga dịka ọ rịrị rue pasent 22.79 (22.79%) n’ọnwa Julai, afọ 2023 site na pasent 18.60(18.60%) ọ bụ n’ọnwa Juun afọ 2022.
Ọ bụrụ na ị lụrụ nwaanyị maọbụ di ọhụrụ, na-akwado ezinaụlọ nke gị, mata na ịmụ nwa ugbua abụghị egwu a chị ụtaba n’aka agba.
Igbo sị na agha a kara aka anaghị eri ngwọrọ.
Dịka gị na onye nke gị na-arị elu akwa, arịtu, bịa ka anyị tupe nye gị azụ ihe ndị chere gị n’ihu ma goolu gaa:

1. Ịmụ nwa: N20,000-N100,000
2. Iji ịwa ahụ mụ nwa: N100,000-400,000
3. ‘Phototherapy’ N70-140,000(maka ịgwọ ịba ọchananya)

bbc Igbo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *