Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere ndịagha Niger jiri gbaa isi akwara na Ecowas agaghị abata na mba ahụ

0 334

Ndị ndu ndịagha Niger weere ọchịchị n’ike ekwuola na ha agaghị anabata ndị mbịarambịa ọkwa ha dị elu bụ maka ihe izendụ banyere nchekwa ndị a.

Ụfọdụ ndị ozi otu Ecowas, African Union nakwa United Nations zipuru ka ha gaa mba Niger adịla njikere ifebata taa.

Mana onyendu ndịagha a weere ọchịchị n’ike gwara Ecowas na mmachi ahụ e nyere ha nakwa iji ndịagha eyi ha egwu emeela ka obi jọọ ndị mba ahụ njọ nke mere na agaghị enwenwu ike ịnabata ha n’udo nakwa nchekwa.

Ha gbakwụnyere na e mechiela ụgbọelu maọbụ ụgbọala ịbata okeala Niger niile.

Akụkọ si na Niamey bụ isioboso Niger kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ hụtara mweghara ọchịchị n’ike ahụ dịka ihe ikuru ume ndụ na-agbanyeghi e ji ntuliaka họpụta Onyeisiala Mohamed Bazoum.

Obi ọchịchị mba Amerịka ekwuola na ọ na-abụ ihe izendụ maka ndịagha Wagner nke Russia ga-ejiri ihe na-eme na Niger bata ebe ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *