Take a fresh look at your lifestyle.

Niger: Mohamed Bazoum akpokuola mba Amerịka maka enyemaka dịka ndịagha weghara ọchịchị.

0 387

Onyeisiala mba Niger nke a napụrụ ọchịchị arịọla mba Amerịka nakwa “nchịkọta mba ofesi ndị ọzọ” ka ha gbata ọsọ enyemaka iji “weghachite usoro ọchịchị zuruoke” na mba ahụ dịka ndịagha weghara ọchịchị ebe ahụ n’izuụka gara aga.

N’akwụkwọ ozi o zipụtara site n’aka ụlọ ntaakụkọ the Washington Post, onyeisiala Mohamed Bazoum kwuru na ọ na-ezipụta ozi a dịka “onye e ji eji”.

Ọ gara n’ihu dọọ aka na ntị na mpaghara Afrịka ahụ nwereike danye n’aka ikike mba Russia site n’otu Wagner Group maliterelarị ịrụ ọrụ n’ụfọdụ mba na mpaghara ahụ.

Ụfọdụ ihe dịka ọgbaghara amalitela ịdapụta n’akụkụ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka kemgbe ndịagha chụpụrụ onyeisiala Bazoum.

N’ụbọchị ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a mara ọkwa kwuo na ha ndị nnọchịteanya ha na mba France, mba Amerịka, Naịjirịa nakwa Togo.

N’ozi a nke ha zịpụtara site n’ihe onyonyo TV, ha kwuru na ọrụ mmadụ anọ ndị nnọchịteanya ndị a abụrụla ihe “akwụsịrị”.

Ka awa ole m ole gachara, onye nnọchịteanya ha na mba Niger bụ Kiari Liman-Tinguiri, gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a “kwesịrị eche ezi echiche” ma mara na “atụmatụ ahụ agaghị amịta mkpụrụ”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *