Take a fresh look at your lifestyle.

MKPEBI ECOWAS MAKA MBA NIGER.

CHIGO,

0 255
  • Mohamed Bazoum ka bụ onye ha ma dịka onyeisiala mba Niger Republic, naanị ihe ọbụla Bazoum mere maọbụ nke o nyere ikike ka e mee, ka Ecowas ga-anabata
  • Ha katọrọ atụmatụ ndị agha iweghara ọchịchị n’ike, nakwa ijichi Mohamed Bazoum na ndị ezinụlọ ya
  • Ha kpọrọ oku ka atọhapụ onyeisiala Mohamed Bazoum ma tinyeghachi ya n’ọkwa onyeisiala
  • Agaghị anabata ịgba arụkwaghị m ọbụla nwereike isi n’aka onyeisiala Mohamed Bazoum
  • Ha ga-ahụta njichi ndị agha jichiri Mohamed Bazoum dịka ntọrọ, ma jidekwa ndị agha jichiri ya ma o nwee ihe ọbụla mere Bazoum na ndị ezinụlọ ya
  • Ọ bụrụ na otu izuụka gachaa, Ecowas ga-eme ihe ọbụla ha nwereike iji weghachite ọchịchị usoro iwu na mba Niger, nke nwereike ịgụnye iji aka ike. N’ihi nke a, ndị isi agha nke mba niile nọ n’otu Ecowas ga-enwe ọgbakọ na-egbughị oge ọbụla
  • A ga-ejide ndị niile aka ha dị n’ọgbaaghara nakwa mwakpo nke ndị aka ha dị ọcha na mba Niger
  • Ecowas katọrọ okwu nkwado ọbụla si n’aka ndị ọchịchị mba ụwa dị icheiche maọbụ ndị agha ọrụ ngo ụfọdụ gbasara etu ndị agha mba Niger si weghara ọchịchị n’ike
  • Ha kelere mba ụwa dị icheiche ndị katọrọla ihe ndị agha mba Niger mere
  • Họpụta otu onye ma ziga ya na mba Niger Repọblik ka ọ ga nye ndị agha ahụ weghaara ọchịchị ozi a si n’aka otu Ecowas

Otu Ecowas kpebikwara ịkpachi enyemaka akụnụba a na-enyebu mba Niger, ma kpọkwaa oku ka mba niile so n’otu Ecowas, nakwa mba ụwa dị icheiche ka ha rube isi na ntaramahụhụ ndị a.

BBC IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *