Take a fresh look at your lifestyle.

Ịta oke anụ na-acha ọbara ọbara.

CHIGO.

0 280

“Ịta oke anụ na-acha ọbara ọbara dịka anụ ehi, anụ ewu adịchaghị mma maka ọrụ ha na-enye ime ahụ mmadụ dịka akiri na imeju”.
“Ịtafe anụ ndị a oke na-akpata mgbali elu ‘cholesterol’ n’ahụ mmadụ”
“Ọ dịghị mma maka ahụike ndị nwere ọrịa ọbara mgbali elu, ọ dịghịkwa mma n’ahụ ndị nwere ọrịa shuga
“Ụmụnwaanyị ndị Afrịka, na-ebutekarị ọnọdụ ahụike a na-akpọ ‘fibroid’, nnyocha sanyesi egosila na e nwere ihe jikọrọ ọrịa a na ịta anụ ndị na-acha ọbara ọbara”.

Na-agbalia na-atatụ ọnụ ndị na-acha ọcha dịka anụ ọkụkọ maọbụ anụ azụ dịka anụ ndị a na-acha ọcha anaghị emetụtacha ahụike ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ etu ndị nke na-acha uhie uhie.
Kama mmadụ iri naanị anụ ndị na-acha ọbara ọbara, e kwesịrị ka ndị mmadụ ritu obere anụ, ha etinyekwa ihe dịka azụ maọbụ ero na nri ha”.
Atatụ anụ, atatụ azụ, atatukwa ero nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ na-edozi ahụ iji hụ na enyere ahụ mmadụ ihe niile e kwesịrị inye ya iji kwụrụ chịm.
BBC IGBO.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *