Take a fresh look at your lifestyle.

Ụdịrị ọrịa Anthrax ole ka e nwere?

chigo dere ya.

0 243

Ụdịrị ọrịa Anthrax ole ka e nwere?

Dịka otu ahụike ụwa WHO siri kwuo, e nwere ụdịrị ọrịa atọ n’ụwa dịka ha nwere njirimara ndị dị iche iche.

Cutaneous anthrax:

Ụdịrị nke a bụ ihe kacha baa ụba n’ụwa. Mmadụ nwereike isi n’akpụkpọ ahụ bute ụdịrị ọkachasị site n’ọnya, ebe mmadụ mere ahụ, ebe yere oye n’anụ ahụ mmadụ nke njem ọrịa nwereike isi banye n’ime ahụ mmadụ. Nke a ga-eme ka ebe ahụ malite ịkọ mmadụ ọkọ ma malite ịcha agwa ojii. Ụfọdụ ndị ga-amalite ịnwe ahụ mgbu, ahụ mkpomọkụ, ịgbọ agbọ nakwa inwe isi ọwụwa.

Gastrointestinal anthrax:

Ụdịrị nke a bụ nke mmadụ nwereike ibute ma o rie nri si n’ahụ anaụmanụ bu ọrịa a. Onye butere ya etu a nwereike ịmalite nwewe ihe mgbu n’afọ ya, gbọwa ọbara maọbụ malite inwe afọ ọsụsa.

Pulmonary anthrax: Ụdịrị nke a bụ nke ndị mmadụ anaghị ebutekarị bụ nke a na-esi site n’iku ume kuba n’ime ahụ mmadụ. Nke a mee, ịmara na onye ahụ gara n’ebe nje ọrịa bara ụba n’ikuku dịka ụdịrị a nwereike ịmalite dịka azụzụ ma mecha mee ka iku ume malite ịra onye bu ya ahụ.

E nweela ụdịrị nke anọ a na-akpọ ‘Injection anthrax’, ụdịrị nke a bụ nke a na-ahụkarị na mpaghara Europe bụ nke a na-esi na ntụtụ bute. Onye butere ụdịrị nke a ga-enweta oke ahụ ịkọ ọkọ, nakwa ndakpo ịrụ ọrụ ime ahụ ya.

Gọọmentị etiti Naịjirịa amalitela itinye usoor ga-ebelata mfesa ọrịa a ugbua. Ka ọ dị ugbua, e dopụla ụlọ ebe a na-azụ anụmanụ ebe a e bu ụzọ hụ ọrịa a iche ugbua.

Amalitekwala inye ndị na-azụ anụmanụ ozụzụ pụrụiche maka nchekwa n’aka ọrịa a dịka a na-agbazị ụmụanụmnụ ọgwụ mgbochi.

bbc igbo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *