Onyeisi na-azụ anụmanụ:Ozo Augustine.
Augustine kwuru na nsogbu anya ya malitere oge ọ bụ nwata, dịka a gbachara ya ọgwụ mgbochi ọrịa.
“Ya bụ ihe bu ụzọ metụta otu anya m, m were otu anya na-ahụtụ ụzọ obere, mana ka oge na-aga, anya nke ọzọ kwụsịkwara ịhụ ụzọ,” Augustine kwuru.
Mana otu nwanne nna ya kpọgara ya n’ebe a na-enye ndị kpuru isi ọzụzụ na mpaghara Oji River nke Enugwu steeti, bụ ebe ọ nọrọ gụọ akwụkwọ.
Nwa amadi a kọrọ akụkọ etu ụfọdụ ndị mmadụ si akpaso ya oke n’ihi na ọ naghị ahụ ụzọ. Otu oge bụ mgbe ọ chọtara ụlọ ebe ọ ga-ebi, mana onye nwe ụlọ ahụ ekweghị enye ya ụlọ n’ihi na ọ bụ onye kpuru isi.
Augustine kwuru na olileanya ya bụ ịkwalite ọrụ ya dịka onye na-azụ anụmanụ, ma nwee ike ịzụlite ndị ọzọ.
bbc igbo.
Leave a Reply