Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị Senetọ si ka e mee maka Ekpa, ọnọdụ nchekwa Ọwụwa Anyanwụ

0 264

Ndị Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akatọọla nọrọ n’ụlọ ma kpoo oku ka a kpụlata onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha ‘Autopilot’bụ Simon Ekpa Naijiria ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ụlọikpe.

A na-ebo Simon Ekpa bụ nwa afọ Naijiria bi mba Finland ebubo itinye iwu nọrọnụlọ n’Ọwụwa Anyanwụ kwa Monde Ekpa iji kpo oku ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bụ onye e ji eji maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.

Ha kpebikwara ịkpọ onyennọchiteanya mba Finland na Naijiria oku maka okwu ọnọdụ Ekpa na mba ahụ.

Onye omeiwu na na-anọchite, Imo-West n’ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Osita Izunaso bụ onye kpalitere okwu a n’Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Wenezde n’aha ndị senetọ si Ọwụwa Anyanwụ.

Izunaso tụrụ arịrị na nọrọnụlọ a kụtụọla ọnọdụ akụnaba Ọwụwa Anyanwụ, agụmakwụkwọ, azụmahịa na ahụike sịrị, “Okwu a bụ iji katọrọ nọrọnụlọ na-eme n’Ọwụẁa Anyanwụ Naijiria.”

“Puku kwuru puku mmadụ atụfuola ndụ ha kemgbe nọrọnụlọ a nke mere ka ndị na-etinye ego na nkwalite akụnaụba gbaapụ n’ Ọwụwa Anyanwụ.”

“Ụlọomeiwu na-atụ uche ma ọ bụrụ na-agbaghị ụzọ owere mgba n’ihe gbasara, ọ gaghị echi, Simon Ekpa ga-eduhie ndị ntọrobịa.”

Enyinnaya Abaribe sịrị, ” onye amaghị ebe mmiri starts beating you, you would not know

” Sit-at-home malitere n’Ọgọstụ 2021 oge Ipob kwuru na ha ga aga nọrọnụlọ n’ihi njichi onye ndu ha.”

“Oge ha mechara kha sị na ha anaghị anọkwa n’ụlọ, ndị omekome zoro n’ahụ nọrọnụlọ.

“Ụfọdụ ndị agboro pụta ha gbuo mmadụ, see ya onyonyo gbasa na soshal midia.”

“O nweghị onye nọ n’Ọwụwa Anynanwụ nọrọnụlọ masịrị. Ọ bụ ndị omekome na-eme ihe.”

“Ha ji iyi egwu na-emenye ndị mpaghara nile egwu.”

Otunba Gbenga Daniels nyere nkwado ya sịrị, na nsogbu ahụ na-emetụ mpaghara ndị ọzọ.

“Ọ dị mkpa ịgwụsị nsogbu .”

“Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla n’ihi ihe a dịka Gụlak bụ ndị a sị na ndị na-amanye nọrọnụlọ gbagburu ya.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *