Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe mba UK na-atụle ịnapụ James Ibori nde nari paundu ọzọ nyeghachi ya Naịjirịa.

chigo.

0 279

Ụlọikpe mba UK na-atụle ịnapụ James Ibori nde nari paudu ọzọ nyeghachi ya Naịjirịa

Otu ụlọikpe na London, mba UK, na-atule inye iwu ka e jichie ego karịrị otu narị nde paunds n’aka aka chịburu Delta Steeti bụ James Ibori, ma weghachite ya na Naịjirịa.

Cheta na a maburu Ibori ikpe ma tụọ ya mkpọrọ na mba UK dịka ụlọikpe kpebiri na o zuru ego Delta Steeti.

Ọ bụ na Dubai ka a nọ nwuchie Ibori n’oge ahụ, n’afọ 2011 ma kpụga ya London bụ ebe a nọrọ kpee ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ nke ọ nọrọ afọ ise.

Mana n’agbanyeghị na Ibori apụtala na mkpọrọ ma lọghachi Naịjirịa, ndị ọkaiwu na London ka na-agba mbọ ịnara ya ọtụtụ akụnụba ya bụ nke ha kwuru na ọ bụ ego o zuru oge ọ nọ na gọọmentị ka o ji nweta akụnụba ndị ahụ.

N’ụbọchị Tọzde, otu ọkaikpe aha ya bụ David Tomlinson nke ụlọikpe ‘Southwark Crown Court’ kwuru na ya na-eme nnyocha gbasara akụnụba James Ibori iji kpebie ole n’ime ha nwereike ịbụ nke o zuru ezu.

Otu onye ọkaiwu ji okwu ahụ, bụ Jonathan Kinnear, gwara ụlọikpe na ego ahụ ga-eru nde paụnd 101.5 – nke karịrị ijeri naịra 100 -, ma kwukwaa na ọ bụrụ na Ibori ewetaghị ego ahụ, o nwereike ịga mkpọrọ ihe dịka afọ ise ruo afọ iri.

Ibori agaghị ikpe ahụ n’ụbọchị Tọzde, mana ọ gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters n’ozi ekwentị na ya ga-etinye akwụkwọ mkpegharị maka ebubo ndị ahụ.

N’afọ 2021, gọọmentị Briten nyeghachiri Naịjirịa nde paụnd anọ na ụma abụọ bụ nke ha kwuru na ha napụtara James Ibori, mana gọọmentị Delta Steeti kwuru na ọ bụ ha ka e kwesịrị inye ego ahụ n’ihi na ọ bụ n’akpa steeti ahụ ka Ibori si wepụ ya bụ ego, ọ bụghị n’akpa gọọmentị etiti.

N’ọdịnso a, Onyeisiala Bola Tinubu na James Ibori enweela ọgbakọ ugboro abụọ n’obi gọọmentị n’Abuja, ya na ndị bụbu gọvanọ na 1999 oge Tinubu bụ gọvanọ Legọs.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *