Take a fresh look at your lifestyle.

Ọrịa Anthrax abatala na Naịjirịa dịka Gọọmentị si kwuo

0 284

Ministri na-ahụ maka ọrụ ugbo ekwuola na ọrịa Anthrax abatala na Naịjirịa n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Joel Oruche wepụtara na Mọnde abali iri na asaa nke onwa Julaị 2023.

Nke a na-abia akụkọ kwuru na a hụrụ ihe yiri njirimaara ọrịa n’otu ugbo ụmụanụmanụ dị na Gajiri n’ụzọ si Abuja gawa Kaduna n’okpuruọchịchị Suleja nke Niger Steeti.

Mpụtara nyocha ngalaba na-ahụ maka ahụike ụmụanụmanụ na Plateau Steeti mere n’abali iri na isii nke onwa Jụlaị 2023, gosiri na ọrịa a dị ire na Naịjirịa.

Nke a na-eso aka na ntị gọọmenti Naịjirịa dọrọ ka ndị mmadụ mụrụ akọ mgbe a chọpụtara Anthrax na mba Ghana dị nso n’izuụka ole ma ole gara aga.

Gọọmentị etiti nakwa nke Niger steeti agbakọtala aka ọnụ ịhụ na a chịkwara ọrịa a aka ọ ghara ifesasị.

A gbachiela ọrụ ugbo ebe a hụrụ ọrịa dịka e kesara ọgwụ mgbochi ọrịa a ruru puku iri ise (50,000).

Gịnị bụ ọrịa Anthrax? Ọ bụ ọrịa ọjọọ na-esi na nje bacteria na Bacillus anthracis nke na-emetụtakaarị ụmụanụmanụ dịka ewu, ehi, atụrụ.

Ọrịa a nwereike imetụta mmadụ ma ọ bụrụ na ha metụ anụmanụ bu ọrịa a ahụ maọbụkwanụ rie anụ ahụ n’ọnụ.

Njirimaara Anthrax n’ebe ụmụanụmanụ gụnyere; ọnwụ otu ntabianya, ịgba ọbara site n’ọnụ maọbụ n’ime ha nakwa n’ike ha.

Nje ọrịa a na-amụbawanye n’ebe unyi dị nakwa ebe ọbụla ha metụtara.

Gọomentị amaala ọkwa ka ndị na-azụ anụmanụ nakwa ọha ka ha kpachara anya banyere ọrịa a ma mee mkpesa ma ọ bụrụ ha hụụ ihe dị aṅyaa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *