Take a fresh look at your lifestyle.

Etu Cynthia Okereke siri laa mmụọ

0 275

Ezinaụlọ onye ejije Nollywood a ma ama dịka Cynthia Okereke agbaala ama na ọ laala mmụọ.

Ndị be ya gwara ndi nta akuko Igbo n’ụtụtụ Wenezde na ọ nwụrụ dịka “ọ daturu obere ọrịa.”

Akụkọ pụtaburu na ọ nọ n’ọnọdụ nkubitu nwamgbenta kemgbe mana odobeghi anya mkpọ kwem etu o siri daba n’ọnọdụ ahụike ahụ.

Ụfọdụ ndị ogbo ya n’ọrụ ejije amalitela izipụta ozi banyere ndụ ya nakwa ihe ndị ha ga-eji echeta ya.

Emeka Rollas bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ ejije Naịjirịa bụ ‘Actors Guild of Nigeria’ gwakwara ndi nta akuko Igbo na “di Okiakụ Okekere gwara m na ọ laala mmụọ n’ezie”.

Otu n’ime ha bụ Joseph Okechukwu dere n’Instagram ya “Kemgbe ihe karịrị afọ 20 m matara gị, ị bụ ezigbo mmadụ ndị mmadụ na-achọ ịnọ nso dịka ị nwere obi dị mma”.

“Ihe nke a akuriela m etu m agaghị enweike ikwu okwu ugbua”.

Cheta na n’ebe Jụlaị nke afọ 2022 na aha Oriakụ Okereke wuru ewu mgbe ndị ntọ tọọrọ ya na onye ejije ibe ya bụ Clemson Cornel.

E merechara tọhapụ ha abụọ ka otu izuụka gachara.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *