Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu abụrụla onyeisioche otu Ecowas

0 227

Otu ‘Economic Community of West African States’ (Ecowas) ahọpụtala onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu dịka onyeisioche ọhụrụ nke otu ahụ.

Ecowas bụ otu jikọrọ mba dị icheiche dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ọ bụ n’ọgbakọ ndị isi ala mba so n’otu Ecowas nke iri isii na atọ bụ nke na-aga n’ihu ugbua na mba Guinea Bissau ka a nọrọ họpụta Tinubu n’ọkwa a n’ụbọchị Sọnde, Julaị 9, 2023.

Tinubu nọchiri onyeisiala mba Guinea Bissau bụ Umaro Embalo dịka onyeisi Ecowas.

“Anyị ga-eji ọchịchị onye kwuo uche ya kpọrọ mkpa, ọ bụ usoro ọchịchị siri ike, mana ọ bụ ya kacha mma,” ka Tinubu kwuru n’ozi ekele ya dịka ọ nabata ọkwa ọhụrụ ahụ e nyere ya.

Ọgbakọ ndị isiala Ecowas nke a na-aga n’ihu ugbua bụ ọgbakọ mbụ nke Bola Tinubu na-esonye na ya na mpaghara Afrịka kamgbe e duchara ya n’iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *