Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ojiegbe agbaala ọtụtụ ọgbaa tum tum ọkụ n’Umuawuchi-Owerre, Imo steeti

0 280

Ndị ojiegbe wakporo obodo Umuawuchi-Owerre nke okpuruọchịchị Ehime Mbano n’Imo steeti n’abalị Sọnde foro chi ụbọchị Mọnde a.

A na-eche na ndị mere mwakpo a pụtara imanye iwu ‘sit at home’ na-aga n’ihu n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kemgbe otu izuụka.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mwakpo mere n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjịrịa dị iche iche n’izu gara aga gụnyere Abia, Ebonyi, na Enugwu dịka onyendu otu alaka ‘Indigenous People of Biafra’ (Ipob) bụ Simon Ekpa pụtara n’etiti ọnwa Julaị 2023, tie iwu maka mmachi mkpagharị ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo otu izuụka, iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

N’ihe onyonyo BBC hụrụ nke na-efegharị na soshal midia ọtụtụ ọgba tum tum na-agba ọkụ dịka olu onye na-ekwu okwu kọwara na ya bụ ihe “mere na be Obi, agbaala ọtụtụ ọgba tum tum ruru asatọ”

Olu onye na-ekwu okwu n’ihe onyonyo ahụ kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara ụgbọala ọhụrụ onye a a kpọrọ ‘Obi’ zutara ọkụ.

A kụsiri ime ụlọahịa ya bụ nwoke dịka ndị olu na-ada n’ime ihe onyonyo ahụ nọ na-akwa arịrị.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ ga-ezighachite ozi banyere akụkọ a mana anyị ka na-eche ịnụ olu ya ruo ugbua.

Ndị gọvanọ Steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwuru na ha amachiela ọnọdụ ‘sit-at-home’ na mpaghara ahụ, ma kwukwaa na ha ga-enye ntaramahụhụ siri ike maka onye ọbụla rubere isi n’iwu ahụ.

Kamgbe ahụ, ndị ekperima bucha egbe nọ na-akpagharị n’obodo dị icheiche, ma n’obodo ndị mepere emepe, ma n’ime obodo, na-awakpo ndị mmadụ pụtara ịgara mkpa ha.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *