Take a fresh look at your lifestyle.

Igwe mmadụ akụgbuola otu nwoke na Sokoto maka ebubo ikwutọ Onyeamụma Muhammad

0 276

Igwe ndị mmadụ gbakọtara kụgbuo otu nwoke aha ya bụ Usman Buda, onye na-egbu anụ na Sokoto, maka ebubo na o kwutọrọ Onyeamụma Islam bụ Muhammad.

Ihe a mere n’ebe elekere iri nke ụtụtụ Sọnde na Sokoto.

Otu onye hụrụ ihe merenụ gwara ndị ntaakụkọ Premium Times na Mazị Buda kwuru okwu mkparị ahụ megide onye amụma Muhammad ugboro atọ.

“Nwanne m nwoke nọ n’ahịa ahụ oge ya bụ ihe mere, oge Usman kwutọrọ onye amụma Muhammad,” nwata nwoke ahụ aha ya bụ Aliyu kwuru.

“Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ kwuru na nwoke ahụ bụ onye isi mgbaka, mana ndị ọzọ sị na ha ma na nwoke ahụ enweghị isi mgbaka ọbụla.”

“Ụfọdụ ndị ntorobịa nọ ebe ahụ gwara ya ka ọ kwụsị ma kwugharịa ihe ahụ o kwuru, mana ọ jụrụ, kama gaa n’ihu kwukwaa ya ugboro atọ ọzọ. Ọ bụ nke a kpatara ndị ntorobịa ahụ ji bido iti ya ihe.”

Aliyu ekwughị ihe bụ ihe ahụ Bode kwuru kpatara e ji tigbuo ya.

Ndị uweojii Sokoto Steeti kwukwara na ya bụ ihe mere n’eziokwu dịka ha wepụtara akwụkwọ ozi n’ụbọchị Sọnde.

Ahmad Rufai bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwuru na tupu ndị uweojii abịaruo n’ahịa ahụ, ndị mmadụ etiela Usman Buda ihe nke ukwuu nke na ọ tọgbọrọ n’ọnọdụ ọjọọ.

“Anyị buuru ya gaa n’ụlọọgwụ Usmanu Danfodio Teaching Hospital maka ọgwụgwọ, bụ ebe ekwupụtara na ọ nwụọla, mana ebe niile ederela jii ugbua,” Rufai kwuru.

O kwuru na ha amalitela nnyocha maka ihe a merenụ.

Ụdị ihe dị otu a mekwara n’ọnwa Mee 2022 dịka ndị mmadụ tigburu nwata akwụkwọ aha ya bụ Deborah Samuel, na-agụ n’ụlọakwụkwọ Shehu Shagari College of Education na Sokoto, n’ihi ebubo na o kwutọrọ Onyeamụma Muhammad.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *