Take a fresh look at your lifestyle.

Naịjirịa ejirila ntakịrị ihe lafere Sierra Leone ma tozuo isonye n’iko mba Afrịka

0 599

Ndị otu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa etozuola isonye n’iko mba Afrịka nke afọ 2023 dịka ha ji ojisi ike merie mba Sierra Leone n’asọmpi itozu oke bụ nke ha gbara taa na mba Liberia.

Ọkpụ goolu atọ a satara abụọ ka Naịjirịa ji merie, dịka Kelechi Iheanacho nyetere goolu na ngwụcha asọmpi ahụ.

Naịjirịa bu ụzọ malite ịcha ọkụ n’asọmpi a dịka Victor Osimhen nyere goolu abụọ n’ime agba nke mbụ, mana ndị Sierra Leone nyetere otu goolu na nkeji 41 site n’aka Mustapha Bundu.

Ọtụtụ ohere bịaara ndị Super Eagles inyekwu goolu abụọ maọbụ atọ ọzọ iji mee ka mmeri a dịrị ha mfe, mana ha gbafuru ohere ndị a ruo mgbe Sierra Leone nyere goolu nke abụọ ha site n’aka Augustus Kargbo na nkeji 84, dịka ọ fọdụrụ naanị nkeji isii ka asọmpi a kwụsị.

Mmeri bụ ihe dị Sierra Leone mkpa n’asọmpi a, mana ọ bụrụgodi na ha gbara nhatanha, Naịjirịa gakwaara itozu ịga Afcon.

Mana dịka nkeji 90 rurula, e tinyekwuru obere oge iji gbazuo maka oge e gburu mgbe asọmpi na-aga n’ihu, ọ bụ n’oge a ka Kelechi Iheanacho nyeteere Naịjirịa goolu nke atọ iji mee ndị Sierra Leone ka ha dị Aaron gbara aka laa.

Mmeri a pụtara na Naịjirịa etozuola isonye n’Iko mba Afrịka a na-akpọ Afcon n’ịchafụ, bụ nke a ga-agba na mba Cote D’Ivoire malite n’ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị ruo ụbọchị 11 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2024.

Ọ bụ eziokwu na asọmpi a ga-adị n’afọ 2024, mana a na-akpọ ya Afcon nke 2023, n’ihi na ọ bụ n’afọ a ka e kwesịrị ịgba ya, mana otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ n’Afrịka bụ Caf n’ịchafụ yigharịrị ya n’ihi na ọnọdụ ihu eligwe ga-akatụ mma n’ọnwa Jenụwarị na mba Cote D’Ivoire karịa etu ọ gaara adị n’oge e kwesịburu ịgba asọmpi ahụ n’afọ a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *