Take a fresh look at your lifestyle.

Ụmụ m nwaanyị atọ ndị na-akwado ịlụ di nwụrụ n’ihe ọdachị ụgbọmmiri kwara a

0 233

Otu onye gbalahụrụ ọnwụ na ihe mberede ụgbọmmiri tara isi mmadụ 106 na mmiri River Nigera akọrọọla ndi nta akuko etu ọtụtụ ụmụnwaanyị ọkachasị ndị nne siri nwụọ dịka ha nọ na-agba mbọ ịgbapụta ụmụ ha oge ihe ọdachi a mere.

A ka na-eme nnyocha ima ihe kpatara isi ọdachị a kpọmkwem mana ndị uweojii kọwara na ihe ọdachi a mere ka akụkụ ụgbọ mmiri ahụ daturu nke mere mmiri ji malite iwubata n’ime ya bụ ụgbọ mmiri.

Ọnụọgụgụ si n’aka ndị gbara mbọ ịgbapụta ndị mmadụ ahụ kwuru na a gbapụtara mmadụ otu nari na iri na ano ụbọchị ihe a mere na Mọnde.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *