Take a fresh look at your lifestyle.

Sweden agụnyela mmekọrịta dịka asọmpi egwuregwu n’ezie? Lee ihe anyị ma

0 533

Gọọmentị mba Sweden ekwuola na o nweghị mgbe ha binyere maọbụ nwee mkpebi ime mmekọrịta nwoke na nwaanyị asọmpi egwuregwu na mba ahụ.

Akụkọ fegharịrị ma wuo na nsonso a na-ekwu nac Sweden abụrụla mba mbụ na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị asọmpi egwuregwu.

Mana mba ahụ kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha.

N’ọsịsa ajụjụ nke ndi ntaakuko zigara ụlọnnochiteanya mba ahụ na Naijiria, onye odeakwụkwọ ha bụ Anna Edoh sịrị, ” Nke a bụ akụkọ ụgha.”

“Mmekọrịta nwoke na nwaanyị abụghị asọmpi egwuregwu na Sweden, o nweghị ngalaba gọọmentị na-ahụ maka egwuregwu mmekọ.”

Edoh gara n’ihu kwupụta na otu ụlọọrụ kpọrọ onwe ha “Swedish Sex Federation’ detara gọọment ha akwụkwọ ozi snị ka anabata ha na otu ndị na-ahazi asompi egwuregwu na mba Sweden.

“Anyị jụrụ ịnabata ha n’ihi na ha tozughị n’ihe ụlọọrụ na-ahụ maka egwuregwu kwesịrị inwe.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ha hụrụ akụkọ ahụ na-ekwu na Sweden anabatala asompi mmekọrịta nwoke na nwaanyị mana ya bụ akụkọ esighị n’aka gọọmentị maọbụ ngalaba na-ahazi asompi egwurewgu na mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *