Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti ahọpụtala ụfọdụ ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka ọ banyere n’ọchịchị.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi Onye ndụmọdụ na mgbasaozi ya bụ Ferdinand Okeoma wepụtara.
Ụfọdụ ndị a ọ họpụtara gụnyere;
Ọkammụta Kenneth Kalu – Odeakwụwkọ gọọmentị
Ụkọchukwu Caleb Ajagba – Onyeisi ndị ọrụ gọvanọ
Ngozi Okoronkwo – Onye ndụmọdụ n’okwu ahụike
Ferdinand Ekeoma – Onye ndụmọdụ na mgbasaozi
Kazie Ukoh – Onyeisi odeakwụkwọ mgbasaozi
Njum Onyemenam – Onyeisi ngụkọ ego
Ogbonnia Okereke – Onyeisi otu ọtawaike n’ịzacha na mkpochasị Aba na Umuahia
Otti nyere iwu ka ndị a bido ọrụ ngwa ngwa na-egbughi oge.
Leave a Reply