Gọọmenti steeti Anambra ebinyela aka n’akwụkwọ na nkwekọrịta n’aka gọọmentị etiti Naịjirịa, site na mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ na iji mejuputa mmemme nkwalite nka na ọzụzụ aka ọrụ na steeti ahụ.
Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo, nke kọmishọna na-ahụ maka mmepe ntorobịa bụ Hon. Patrick Agha Mba, na Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ , Dọkịnta Chris Ngige, n’aha gọọmenti etiti bịanyere aka na nkwekọrịta ahụ.
E binyere aka na MOU n’ụlọ ọrụ Minista nke Federal Ministry of Labour na Employment na Abuja.
Njikọ aka na gọọmentị etiti sitere na mbọ Soludo na-agba iji luso enweghị ọrụ nke ndị ntorobịa ọgụ na steeti ahụ.
Leave a Reply